Exodus 30:17-21

Efere mmiri ọsịsa

17Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 18“Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja. 19Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya. 20Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ, 21ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”

Copyright information for IboBIU